Igbo Language Scheme of Work Primary 5 Federal

Schemeofwork.com
Scheme of Work

Nigeria Language Syllabus, Igbo Language scheme of work primary 5 Federal, gburugburu ọcha, Igụ ọnụọgụgụ, Schemeofwork.com

FIRST TERM IGBO LANGUAGE SCHEME OF WORK FOR PRIMARY FIVE

PRAỊMARỊ NKE ISE TAAM NKE MBỤ

IZUUKA 1

ISIOKWU

A)ASỤSỤ: Ọnụọgụgụ

B) AGỤMAGỤ: Abụ

NDINISIOKWU

Odide na ogugu  onuogugu  1-100

i. Nkọwa abụ

ii. Ụdị abụ dị iche iche dịka abụ nwa, abụ otito, akwamozu, ikpe, dgz.

IHE ONYENKUZI GA-EME

Idepụta ọnụọgụgụ

– Ịgụ ọnụọgụgụ

-Ịrụgosi ọnụọgụgụ

Ịkọwa abụ n’ụzọ dị nkenke

– Idepụta njirimara abụ dịka: echiche miri emi, ọgbara agbara ọgbara ọgbara, (Stanzers)

-Ịgụpụta abụ nwa dịka: “onye mụrụ nwa na-ebe akwa? Egbe mụrụ nwa naebe akwa….”

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

-Ịgụpụta ọnụogụgụ

-Iji ọnụọgụgụ mebe ahịrịmfe

– Ịkpọsịta na ikwupụta njirimaraabụọ abụ nwere

– Ịgụpụta abụ ụfọdụ onye nkuzi gụụrụ ha

– Ide ihe odide.

IZUUKA 2

ISIOKWU

A) ASỤSỤ: Aghọtaazaa

B) OMENALA: Idebe gburugburu ọcha

NDINISIOKWU

i. Ihọrọ out aghọtaazaa dị n’akwụkwọ a họpụtara gụọ ma zaa ajụjụ so ya.

i) Nkowa ndebe gburugburu ọcha

ii) Ebe ndị bụ gburu gburu gị

IHE ONYENKUZI GA-EME

Igụ otu aghọtaazaa sitere n’akwụkwọ ọgụgụ a họpụtara.

– Ịkọwa ihe bụ gburugburu

– Ịkọwa ihe bụ idebe gburugburu ọcha

– Gurugburu anyị dị ka ụlọ obibi, ụlọ ahịa, ebe anyị na-agụ akwụkwọ, dgz

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ịza ajụjụ sitere n’aghọtaazaa

– Inye ọmụmaatụ ndị ọzọ ebe bụgasị gburugburu ha

IZUUKA 3

ISIOKWU

A) ASỤSỤ: Ọnụọgụgụ

B) AGỤMAGỤ: Abụ

NDINISIOKWU

Odide na ọgụgụ ọnụọgụgụ (100-200)

Ọgụgụ otu abụ sitere n’akwụ-kwọ abụ a họpụtara

-Kọwaa echiche dị nay a, zipụta nghọta, mmasị na obiụtọ dị n’abụ

IHE ONYENKUZI GA-EME

Onye nkuzi idepụta ma gụpụta ọnụọgụgụ

– Ịgụpụta out abụ sitere n’akwụkwọ abụhọpụtara

– Ịchọpụta echiche dị naya

– Ịkọwa ihe mmụta sitere na ya.

– Ịkọwa atụmatụokwu dịn’abụ a gụrụpụtara.

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

Isonye onye nkuzi gụpụta ọnụọgụgụ

– Ịjụ ajụjụ

– Ịbụ abụ

IZUUKA 4

ISIOKWU

OMENALA: Idebe gburu-gburu ọcha

B) AGỤMAGỤ:

Abụ

NDINISIOKWU

i. Ngwa ndị e ji edebe gburugburu ọcha

ii. Ụzọ Nchekwa ngwa ndị a

i. Ọgụgụ otu abụ sitere n’akwụkwọ abụ a họpụtara

ii. Nkọwa echiche dị sn’abụ

IHE ONYENKUZI GA-EME

– Ịkọwapụta ngwa e ji edebe gburugburu ọcha dịka: nnukwu mma, nkata ahịa, ngacha, ọgụ,azịza,dgz.

– Ịkọwapụta ụzọ ụfọdụ e si edebe akara ngwa e ji edebe gburugburu ọcha

dịka – iweba ha ebe mmiri agaghị ama ha.

-Ịgụpụta abụ sitere n’akwụkwọ ọgụgụ a họpụtara

-Ịchọpụta echiche dị na ya.

– Ịkọwa okwu ọhụụ dị na ya

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Igosi ka e si eji ngwa ndị ahụ edebe gburugburu ọcha

– Isepụta akara ngwa ụfọdụ

-Ikwu ụzọ a ga-esi chekwaa ngwa ndị a.

-Ịgụ abụ

-zipụta nghọta dị n’abụ

-Izipụta mmasị na obi ụtọ ha nwere n’abụ site n’isonye n’abụ ha na-agụ

IZUUKA 5

ISIOKWU

A)ASỤSỤ: Aghọtaazaa

B) AGỤMAGỤ: Abụ

NDINISIOKWU

IHE ONYENKUZI GA-EME

I. Ọgụgụ otu

aghọtaazaa dị n’akwụkwọ a họpụtara

Ịbụ otu abụ a tụleren n’isi

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ịgụpụta otu aghọtaazaa

– ịkọwa okwu ọhụrụ batara n’aghọtaazaa.

– Ịjụ ụmụakwụkwọ ajụjụ banyere isiokwu dị n’aghọtaazaa.

– Onye nkuzi ga-ahọpụta otu abụ ma mee ka ụmụaka soro ya gụgharịa ya ugboro ugboro

IZUUKA

-Ịgụ ihe ọgụgụ

– Ịjụ ajụjụ

– Ịza ajụjụ

Ịgụ otu abụ ma buru ya n’isi

IZUUKA 6

ISIOKWU  

A) ASỤSỤ: Ọnụọgụgụ

B) OMENALA: Idobe gburugburu ọcha

NDINISIOKWU

Ọnụọgụgụ 200-300

Ụzọ Nlekọta gburugburu dịka: ịza ihe, ikpofu ahịhịa ebe o kwesiri

IHE ONYENKUZI GA-EME

– Idepụta na ịgụ ọnụọgụgụ ma mee ka ụmụaka soro ya gụpụtakwa ya.

Onye nkuzi ịkpọsita ụzọ ụfọdụ e si elekọta gburugburu dịka ịza ihe, ịkpọ ihe ọkụ, ikpofu

ahịhịa,dgz.

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ịgụ ọnụọgụgụ.

– Ide ọnụ ọgụgụ

-Ịkpọsịta ụzọ ụfọdụ e si elekọta gburugburu.

IZUUKA 7

ISIOKWU

A) Agụmagụ: Akụkọ ifo

B) OMENALA: Idebe gburugburu ọcha

NDINISIOKWU

Akụkọ okike

Ọrụ dịịrị onye ọ bụla n’idebe gburugburu ọcha dịka: Nne na nna, ndị ntorọbịa na ụmụaka

IHE ONYENKUZI GA-EME

Ịkọrọ ụmụ akwụkwọ akụkọ okike dị iche iche dị ka: Genesisi 1. Okike Chineke kere dị

n’akwụkwọ Nsọ(Bible); Ịkọrọ ụmụakwụkwọ akụkọọdịnala ụfọdụ gbasara okike.

– Idepụta agwa ụfọdụ n’ụgbọojii.

– Ịkọwa ihe gbasara idobe gburugburu ọcha

– Ịgụpụta ụzọ ụfọdụ onye ọ bụla kwesiri isi dobe

gburugburu ọcha dịka: ọzịza, nhicha, nzacha hịhịa, ịtụtụpụ mpekele

akwụkwọ dị n’ala, ịsachasị ngwa e ji sie ma rie nri,dgz

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ịjụ ajụjụ

– Inye ọmụmaatụ nke ha

– Idetu ih

– Inye ọmụmmatụ nke ha

– Idetu ihe odide

IZUUKA 8

ISIOKWU

A) ASỤSỤ: Ọnụọgụgụ

B) OMENALA: Idebe gburugburu ọcha

NDINISIOKWU

Ọnụọgụgụ 300-400

Uru idebe gburugburu ọcha bara

IHE ONYENKUZI GA-EME

Idunye ụmụakwụkwọ ịgụ ọnụọgugụ ha gụrụla n’oge gara aga

– Idetu ma gụpụta

ọnụọgụgụ ndị ọzọ n’ụgbọ ojii

– Iji ọnụọgụgụ mebe ahịrịokwu.

– Ịkọwara ụmụakwụkwọ ihe ụfọdụ na-ebụtegasị ọrịa dị iche iche dị ka iru inyi

-Ịkpọpụtara ụmụakwụ-

kwọ ajọ ihe ọrịa nwere ike ibutere mmadụ.

– Ikwupụta uru dị iche iche dị n’idebe gburugburu ọcha

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Igụ ọnụọgụgụ

– Ide ọnụọgụgụ, sụọ asụsụ ma dee ya ede

– Ịjụ ajụjụ

– Ide ihe odide

– Inye ọmụmaatụ ndị ọzọ ha chetara

IZUUKA 9

ISIOKWU

  1. ASỤSỤ: Aghọtaazaa

B) AGỤMAGỤ: Akụkọ ifo

NDINISIOKWU

ii. Ịgụ aghọtaazaa

ii. Nkọwa ihe a gụrụ

Akụkọ ifo metụtara ụmụanụmanụ

IHE ONYENKUZI GA-EME

– Ịgụ otu aghọtaazaa sitere n’akwụkwọ ọgụgụ ahọpụtara

– Ịchọpụta okwu ọhụrụ dị n’ihe a gụrụ

– Ịkọwapụta okwu ndị ahụ

– Iji okwu ndị ahụ mebe ahịrịmfe.

– Ịkọrọ ha ifo nkenke ole na ole metụtara ụmụ- anụmanụ

-Ichọpụta ka omumeụmụanụmanụ ndị ahụ siri yite omume ndị mmadụ

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ịjụ ajụjụ

– Ịza ajụjụ sitere n’ihe a gụrụ.

– Ịchọpụta okwu ọhụrụ

– Ịjụ ajụjụ

– Ikwu uche ha banyere akụkọ ifo ha gere

IZUUKA 10

ISIOKWU

A) OMENALA: Idebe gburugburu ọcha.

B) AGỤMAGỤ: Abụ

NDINISIOKWU

Ndebe gburugburu ọcha.

Ibu otu abụ n’isi

IHE ONYENKUZI GA-EME

-Idunye ụmụakwụkwọ ikwupụta ọrịa ụfọdụ ndị mmadụ na-ebute site

n’edebeghi gburugburu ọcha

-Ikwupụta ụzọ dị iche iche a ga-esi gbochie ọrịa ndị ahụ.

– Ịgụpụtakwa uru dị n’idebe gburugburu ọcha

– Iwepụta/ịhọrọ otu abụ n’ime akwụkwọ abụ a họpụtara.

-Onye nkuzi ịgụpụta abụ ahụ n’onwe ya ugboro ugboro

– Iduzi ụmụ akwụkwọ n’ịgụ abụ ahụ ma gụọ ya ugboro ugoro

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ịkpọpụtagasị ụzọ e si edebe gburugburu ọcha.

– Ịgụpụta uru ụfọdụ dị n’idebe gburugburu ọcha

-Ịgụ abụ

-Iso onye nkuzi gụọ abụ.

IZUUKA 11

ISIOKWU

 A) ASỤSỤ: Ọnụọgụgụ

B)AGỤMAGỤ: Abụ

NDINISIOKWU

Iji ọnụọgụgụ mebe ahịrịokwu

Ịkpọpụta Abụ e bu n’isi

IHE ONYENKUZI GA-EME

Ịkọwa ihe bụ ahịrịokwu

-Ịgụpụta ọnụọgụgụụfọdụ

-Iji ọnụọgụgụ ụfọdụ mebe ahịrịmfe.

– Idepụta ahịrị mfe n’ụgbọojii.

– Ịgụgharị Abụ a họpụtara

– Iduzi ụmụakwụkọ ịgụpụta abụ ha mụrụla

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

-Ịgụ ọnụọgụgụ

-Imebe ahịrịokwu

-Idepụta ahịrịokwu

– Ịgụ abụ n’eleghị anya n’ime akwụkwọ

– Idetu abụ ha gụrụ.

– Ijụ ajụjụ

– Ịza ajụjụ

IZUUKA 12

ISIOKWU

  1. OMENALA: Idobe gburugburu ọcha

B) AGỤMAGỤ: Abụ

NDINISIOKWU

Ihe mmụta na mmasị dị n’idebe gburugburu ọcha.

Ịkọwapụta echiche dị n’abụ e bu n’isi

IHE ONYENKUZI GA-EME

– Idunye ụmụakwụkwọ ikwu ihe ha chere o ji dị mkpa idebe gburugburu anyị ọcha.

-Ịchọpụta echiche ụmụ- akwụkwọ banyere ọrịa na ọnwụ.

– Ịkọwapụta usoro e si eme nnyocha abụ dịka: olu e jiri dee Abụ, Asụsụ nka dị n’Abụ.

– Iduzi ụmụakwụkwọ ịchọpụta echiche Odee nwere n’Abụ ha gụrụla ma buru n’isi

IHE UMUAKWUKWO GA-EME

– Ikwu uche ha n’ihe ọmụmụ

– Ide ihe odide

– Ịjụ na ịza ajụjụ

-Ikwu okwu

-Ịjụ ajụjụ

– Idetu ihe

IZUUKA 13: Mmụgharị Ihe a kuziri

IZUUKA 14: Ule na Mmechi

Nigeria Language Syllabus, Igbo Language scheme of work primary 5 Federal, gburugburu ọcha, Igụ ọnụọgụgụ, Schemeofwork.com

Share this Article
Leave a comment
adbanner