Year 4 – 6 NERDC Igbo Curriculum for Primary 4 to 6. Omenala, odịdị mmadụ, Nzikọrịta ozi , ikwu okwu na telefoonu – Schemeofwork
Igbo Curriculum for Primary 4
THEME 1: ASỤSỤ
Week 1
Topic: Ọnụọgụgụ (1- 200)
Performance objectives
- ịgụtalị ọnụọgụgụ site n’otu ruo narị abụọ
- iji ọnụọgụgụ ndị a sụọ asụsụ
- Idetalị ọnụọgụgụ ndị a.
Contents
- Ọnụọgụgụ site n’otu ruo na narị abụọ (1-200)
- Odide ọnụọgụgụ
- Asụsụ nabatara ọnụọgụgụ
Teacher’s Activities
- Ịgụpụta ọnụọgụgụ
- Idepụta ọnụọgụgụ
- Iji ọnụọgụgụ sụọ asụsụ
- Ịmakọta nọmba na ọnụọgụgụ
Student’s Activities
- Ọgụgụ
- Ngosipụta
- Ọmụmaatụ
- Nkọwa
- odide
- Mmakọta
Teaching & Learning Material
- Ngwa e ji agụ ọnụọgụgụ dk: ukwu osisi e kere na narị na narị
- Chaatị
- kaadị ọnụọgụgụ
Evaluation Guide
- ịza azịza
- ịgụ ihe
- ide ọnụọgụgụ 1-200
- Ịmakọ nọmba Na ọnụọgụgụ.
Week 2
Topic: Ịkọwapụta ihe
Performance objectives
- ịkọwatalị ihe
- Ikwulite n’ụzọ dị were were ọdịdị ihe ha na-ahụ Anya, nụrụ Na ntị, siri n’imi, Na metụrụ aka.
- izipụta ndịiche dị n’etiti ihe ha nụrụ na ntị, hụrụ n’anya , siri n’imi na metụrụ aka
Contents
- Nkọwa ọdịdị ihe dị iche iche: Ọrụ nka dị iche iche dk ihe e sere ese, ihe a kpụrụ akpụ, ihe a tụrụ atụ, ihe a kpara akpa dg.
- Ihe dị ndụ dk: anụmanụ, osisi, mmadụ dg.
- Ụzụ dị iche iche dk:ụda egbe, ụgbọala, okwu, ube nnụnụ / anụmanụ
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ejije
- Ịjụ ajụjụ
- Mmetụ aka
- Isi n’imi
- Mkpagharị (gburugburu ụlọakwụkwọ)
Student’s Activities
- Ijụ na ịza ajụjụ
- Ịkọwa etu ihe dị
- Ige nt
- Ikwu ndịiche dị n’etiti ihe ha nụrụ na ntị, hụrụ n’anya, siri n’imi na metụrụ ak
Teaching & Learning Material
- Eserese
- Ọrụ nka dị iche iche
- Anụmanụ na osisi
- Redio na Tepurekọda Ngwa mmetụaka na Nsinimi
Evaluation Guide
- ịkọwalite ihe
- ije ejije
- ide ihe
- ise ihe
Week 3
Topic: Ọgụgụ na Aghọtaazaa dị mfe
Performance objectives
1 Ịgụ ederede dị mf
2 Ịchọpụta mkpụrụokwu ndi tara akpụ
3 Ịkọwa ha site n’iji ọkọwa okwu Igbo
4 Ịza ajụjụ sitere n’ederede ha gụrụ
Contents
- Ogụgụ ederede
- Aghọtaazaa dị mfe mkpụrụokwu ndị tara akpụ Ntụgharị uche n’ihe a gụrụ Ịgba mbọ zaa ajụjụ sitere n’ederede a gụrụ
Teacher’s Activities
- Ọgụgụ
- Nkowa
- Ọmụmaatụ
- Odide
- Ajụjụ
Student’s Activities
- Ịgụ ederede
- Ịkpọpụta na ịtọsa mkpụrụokwu na akpaalaokwu
- Ịza ajụjụ
- Ịchọpụta okwu ọhụrụ
- batara n’ihe a gụrụ.
Teaching & Learning Material
- Akwu kwo o gụgụ a họpụtara
- Ụgbọedemede
- Ọkaasụsụ (Ọkọwaokwu)
Evaluation Guide
- Ikwu ihe abụọ ha mụtara site n’ederede
- Ịkọwa mkpụrụokwu abụọ tara akpụ
- I za ajụjụ abụọ onye nkụzi ga – ajụ site n’ihe ha chọpụtara
Week 4
Topic: Edemede nduzi
Performance objectives
- idetali ederede otu nkebi a haziri ahazi
- ikwu ihe ndị dị mkpa na nkebi edemede paragrafụ)
Contents
- Njirimara nkebi edemede dk:
- Ikwu maka otu isiokwu
- Edemede otu nkebi a haziri ahazi
Teacher’s Activities
- Mkparịtaụka
- Ọmumaatụ
- Nkọwa
- Odide ndekọrịta
- Nduzị
Student’s Activities
- Ịkparịta ụka
- Ịtụta aro ihe onyenkụzi ga-ede n’ụgbọojii
- Ịgụgharị ihe onyenkụzi dere n’ụgbọojii
- Idetu ihe e dere n’akwụkwọ ha
- Ide edemede nke ha.
Teaching & Learning Material
- Ụgbọojii
- Akwụkwọ ọgụgụ
- Chaatị Ederede
Evaluation Guide
- igosi nkebi ole dị n’ederede.
- idetu ihe e dere
- ide edemede nke ha
Week 5
Topic: Ịzụ na ire ahịa
Performance objectives
- ịkparịtaụka iji zipụta ọnọdụ ịzụ na ire ahịa
- ikwu ihe ha na-ahụ n’ọdụ ahịa
- ikwe o nu ahi a i kwụ ụgwọ ihe ha zụrụ
- ikwu ụzọ mgbochi mmegbu onye na-azụ ahịa.
Contents
- Mkparịtaụka metu tara o zụzụ na orire ahịa
- Ihe ndị a na-ahụgasi n’ọdụ ahịa
- Ịkwụ ụgwọ ihe ha zụrụ
- Ụzọ mgbochi mmegbu
- onye na-azụ ahịa
Teacher’s Activities
- Mkparịtaụka
- Ajụjụ
- Nkọwa
- Nru gosi
- Ejije
Student’s Activities
- Ime mkparịtaụka gbasara ịzụ na ire ahịa
- Ịkpọsipụta ihe ụfọdụ ha na-ahụ n’ọdụ ahịa
- Ime nkenke ejije iji
- gosipụta onye na-azụ na onye na-ere ahịa.
Teaching & Learning Material
- Ụgbọojii, eserese na-egosi ndị na-ere ahịa dị iche iche
Evaluation Guide
- Ije ejije na-egosi ndị na-azụ na ndị na- ere ahịa
- idepụta mkpụrụokwu ndị metụtara ịzụ na ire ahịa
- idepụta ụzọ abụọ e nwere ike isi megbuo onye na-azụ ahịa
- ikwu otu u zo a ga-esi gbochie immegbu onye na-azụ ahịa
Year 4 NERDC Igbo Language Curriculum for Primary 4. ọnụọgụgụ site, edemede, Agwụgwa dị mfe, megbuo onye na-azụ ahịa – Schemeofwork
THEME 2: AGỤMAGỤ
Week 1
Topic: Ejije dị nkenke
Performance objectives
- ịsụtali asụsụ e ji azụ ahịa, arụ ọrụ ubi, ekwu okwu na telefoonu, na emume ncheta ọmụmụ mmadụ
- ime omume a na-eme n’ịzụ ahịa, ncheta ọmụmụ na ikwu na telefoonu
Contents
- ịzụ ahịa
- ịrụ ọrụ ubi
- ikwu okwu na telefoonu
- ime emume ncheta ọmụmụ
Teacher’s Activities
1 Ejije
2 Ajụjụ
3 Ngosipụta
4 Nkọwa
Student’s Activities
- Ije ejije izụ ahịa
- Ije ejije ọrụ ubi
- Ije ejije ikwu okwu na telefoonu
- Ije ejije ncheta ọmụmụ
- Ịjụ na ịza ajụjụ
Teaching & Learning Material
1 Ngwaahịa
2 Ngwa ọrụ ubi
3 Telefoonu
4 Eserese
5 Ngwa mmemme ncheta ọmụmụ
Evaluation Guide
1 ijije asụsụ e ji azụ ahia
2 ijije asụsụ telefoonu.
Week 2
Topic: Abụ na uri dị mfe (Egwu)
Performance objectives
- Igụ abụ maọbụ uri (egwu) dị mfe
- Ikụ egwu site n’iji ngwa egwu
- Ikwu uru abụ/egwu/uri bara
Contents
- Abụ ịgụgụ nwa
- Uri ọrụ
- Uri/egwu a na -agba agba n’o gbọ
- Uri/abụ ndịụka.
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọmu maatu
Student’s Activities
- Igụ abụ/uri dị mfe
- I ku egwu/ur
- Igba egwu /uri
- Ikwu uru egwu/uri/abụ bara
- Ije ejije
Teaching & Learning Material
- Agwụgwa dị mfe (Gwa m gwa m gwa m)
- Ilu dị mfe
- Akụkọ ifo Ụ
Evaluation Guide
- Agwa ọma na agwa ọjọọ
- Njirimara ndị Igbo
- Akaọrụ ndị Igbo
- Nri na Ejiji ndị Igbo
Igbo Curriculum for Primary 5
THEME 1: ASỤSỤ
Week 1
Topic: Ọnụọgụgụ (1 – 400)
Performance objectives
- ịgụtali ọnụọgụgụ site n’otu ruo na narị anọ.
- iji ọnụọgụgụ ndi a mee ahịrịokwu
- Ide ha
Contents
- Ọnụọgụgụ site n’otu ruo na narị anọ
- Iji ọnụọgụgụ mee ahịrịokwu
- Odide ọnụọgụgụ
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ngosipụta
- Ọmụmaatụ
- Ajụjụ na azịza
- Asọmmpi
Student’s Activities
- Igụpụta ọnụọgụgụ
- Iji ọnụọgụgụ ndị a sụọ asụsụ
- Idepụta ọnụọgụgụ
- Ịrụgosi ha
- Ịmakọ ọnụọgụgụ na mkpụrụokwu
- Ịsọ mpi
Teaching & Learning Material
- Ngwa ọnụọgụgụ dịka: ukwu osisi e kere na narị na narị
- Chaatị
- Mgbubam
Evaluation Guide
- ịgụ ọnụọgụgụ site n’otu ruo na narị anọ
- iji ọnụọgụgụ mee ahịrịokwu ise
- ide ọnụọgụgụ e wepụta
Week 2
Topic: Aghọtaazaa (Iji nkenke akụkọ ndị a ho pu tara ku zie aghọtaazaa)
Performance objectives
- Ịgụ Igbo nke ọma
- I ko wa ihe a kọrọ n’ime akụkọ ahụ
- Iza ajụjụ so ihe ha gụrụ
Contents
- Ọgụgụ
- Nkọwa ihe a gụrụ
- Nkọwa okwu ndị siri ike n’ihe ndị a gụrụ
Teacher’s Activities
- Ọgụgụ
- Nkọwa
- Ajụjụ na azịza
- Ọmụmaatụ
Student’s Activities
- Ịgụ ihe ọgụgụ
- Ịju na ịza ajụjụ
- Ikwu uche ha banyere ihe ha gụrụ
Teaching & Learning Material
- Akwụkwọ ọgụgụ
- Eserese
- Tepurekọda
Evaluation Guide
- Ịkọwa isiokwu dị n’ime ihe ha gụrụ
- Ịkọwa mkpụrụokwu ato siri ike dị n’ime ihe ha gụrụ
- Ịza ajụjụ banyere ihe ha gụrụ
Week 3
Topic: Akaraedemede
Performance objectives
1 ikwu akara edemede dị iche iche
2 itinyetali akara edemede kwesịrị ekwesị
3 ịchọpụta na izipụta akaraedemede dị iche iche n’ahịrịokwu
Contents
- Akaraedemede dị iche iche dk: kpọm, rịkọm, kpọmrikọm, akarauhie, akaramkpu, akaraajụjụ dg
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọmụmaatụ
- Nrụgosi
- Ọkpụkpọ
Student’s Activities
- Ikwu akaraedemede dị iche iche
- Itinye akaraedemede kwesịrị ekwesị
- Ịchọpụta na ịrụgosi akaraedemede n’ahịrịokwu
Teaching & Learning Material
- Ụgbọoji
- aadị
- Mgbubam
- Eserese
- Redio
- Tepurekọda
Evaluation Guide
- ịkpọpụta
- akaraedemede atọ
- itinye akara edemede atọ n’ebe kwesịrị ekwesi
Week 4
Topic: Edemede nduzi
Performance objectives
1 ịkọwa ihe bụ edemede
2 ikwu njirimara edemede 3 ịtụta aro ihe a ga-ede
4 idetu ihe e dere
5 ide edemede nke ha
Contents
1 Nkọwa ihe bụ edemede
2 njirimara edemede dịka: isiokwu, mmalite, ahụ, nhazi, mmechi
3 Ntụta aro ihe onyenkuzi ga- ede n’ ụgbọojii
4 Ndetu ihe e dere
5 Odide edemede nke ha
Teacher’s Activities
1 Nkọwa
2 Ọmumaatụ
3 Ngosipụta
4 Ajụjụ na azịza
5 Ndekọrịta nke klaasị
Student’s Activities
- Ịkọwa ihe bụ edemede
- Ikwu njirimara edemede
- Ịkparịta ụka banyere isiokwu
- Ịtụta aro ihe onyenkuzi ga-ede n’ụgbọojii
- Idetu ihe e dere n’akwụkwọ ha
- Ide edemede nke ha
Teaching & Learning Material
1 Eserese
2 Mgbubam
3 Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
1 ikọwa ihe bụ edemede
2 ide ahịrịokwu anọ
3 ịza ajụjụ
Week 5
Topic: Ịkọwapụta ọdịdị mmadụ
Performance objectives
- ịkọwatalị ọdịdị mmadụ
- ịtụle na itụnyere odịdị mmadụ dị iche iche
Contents
- Nkọwa ọdịdị mmadụ (ụcha ogologo, ibu, dg)
- Ntụle na ntụnyere ọdịdị mmadụ dị iche iche
Teacher’s Activities
1 Nkowa
2 Ọmumaatụ
3 Ngosipụta
4 Ogụgụ
5 Odide
Student’s Activities
- Nkọwa ọdịdị mmadụ (ụcha ogologo, ibu, dg)
- Ịtụle na ntụnyere ọdịdị mmadụ dị iche iche
Teaching & Learning Material
1 Eserese
2 Chaati
3 Akwụkwọ ọgụgụ
4 Ụmụaka n’onwe ha
Evaluation Guide
- Imebe ahịrịokwu
- Ise eserese iji ntụnyere ọdịdị mmadụ abụọ
Week 6
Topic: Mmụgharị akaraedemede
Performance objectives
- ịkpọpụta akaraedemede dị iche iche n’ime ederede
- itinyetali akaraedemede n’ebe kwesịrị ekwesị
Contents
- Mkpọpụta akaraedemede dị iche iche dịka: kpọm na ndị ọzọ
- Nchọpụta na nzipụta akaraedemede
- Ntinye akaraedemede n’ebe kwesịrị ekwesị
Teacher’s Activities
- Nkowa
- Ọmumaatụ
- Ọkpụkpọ
- Odide
- Asọmmpi
Student’s Activities
- Ịkpọpụta akaraedemede
- Ịchọpụta
- akaraedemede n’ime ederede
- Itinye akaraedemede n’ahịrịokwu
- Ịrụgosi akaraedemede
- Ịsọ mpi
Teaching & Learning Material
- Kaadị
- Eserese
- Redio
- Tepurekọda
- Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
- ịza ajụjụ
- itinye akaraedemede
- ịrụgosị akaraedemede.
- idepụta akaraedemede.
Week 7
Topic: Idezu Akụkọ
Performance objectives
- ịkpọpụta ihe ndị a na-ahụ n’edemede dịka: isiokwu, mmalite, ahụ na mmechi edemede
- idechapụ akụkọ a kọfọrọ site n’ichemi echiche
Contents
- Nhazi edemede dịka: mmalite, ahụ na mmechi edemede
- Ndezu akụkọ a kọfọrọ akọfọ
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọmụmaatụ
- Mkparịtaụka
- Ajụjụ na azịza
- Ndezu
- Ngụgharị
Student’s Activities
- Ịkpọpụta ihe ndị a na- ahụ n’edemede.
- Ịkparịta ụka maka ihe a ga-ede
- Idezu akụkọ
- Ịgụgharị ihe e dere
Teaching & Learning Material
- Ederede
- Akwụkwọ ọgụgụ
- Tepurekọda
- Ụgbọojii
Evaluation Guide
- ịjụ na ịza azịza.
- idezu akụkọ abụọ
- ịchọpụta isiokwu akụkO
Year 4 – 6 NERDC Igbo Curriculum for Primary 4 to 6 – Schemeofwork
THEME 2: AGỤMAGỤ
Week 1
Topic: Abụ nkenke
Performance objectives
1 ịgụpụta abụ nke ọma
2 izipụta nghọta, mmasị na obiụtọ dị n’abụ
3 ibu abụ n’isi
4 ịkọwa echiche dị n’abụ
Contents
- Abụ mfe dị iche iche
Teacher’s Activities
1 Nkọwa
2 Ọgụgụ
3 Nzipụta
4 Ọmụmaatụ
5 Ajụjụ na azị za
6 Ndetu
Student’s Activities
- Ige ntị
- Ịgụ abụ
- Ibu abụ n’isi
- Ịkọwa echiche dị n’abụ
- Ije ejije
- Idetu abụ
- Ise eserese
Teaching & Learning Material
- Chaatị
- Eserese
- Akpụrụakpụ
- Mgbubam
Evaluation Guide
- igụ abụ nkenke atọ nke ọma
- ikowa echiche dị n’abụ ha gụrụ
- ise eserese ịkọwa otu
- abụ
Week 2
Topic: Akụkọ ifo
Performance objectives
- ịkọ na ịgụ akụkọ ifo
- izipụta mmasị, nghọta, ọbiụtọ na ezigbo agwa.
- ịtụle agwa dị n’akụkọ
- ikwu ihe mmụta si n’akụkọ ifo
Contents
- Akụkọ ifo dị iche iche dk: nke okike na nke na-akụzi ezi omume
- Ntụle agwa
- Ihe mmuta
Teacher’s Activities
- Ọkụkọ.
- Ọgụgụ
- Nzipụta
- Ọmụmaatụ
- Ajụjụ na azịza
- Nchịkọta
Student’s Activities
- Ikọ akụkọ.
- Ịgụ akụkọ
- Ịjụ na ịza ajụjụ
- Ije ejije.
- Ịtụle agwa
- Ikwu ihe mmụta
Teaching & Learning Material
- Eserese
- Akpụrụakpụ
- Chaatị
- Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
- ịkọ akụkọ
- ịkọgharị akụkọ.
- ịgụ akụkọ ifo e dere ede
Week 3
Topic: Ejije nkenke e depụtara e depụta
Performance objectives
- Ịgụ ejije e depụtara
- Iso mee ejije ahụ
- Ikọwa mmụta dị n’ejije ahụ
Contents
- Ejije nkenke e depụtara e depụta
- Ihe mmụta dị n’ejije
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Nzipụta
- Ajụjụ na
- Aziza
- Omụmaatụ
Student’s Activities
- Ige ntị
- Ịgụ ejije
- Ije ejije
- Idetu ejije
Teaching & Learning Material
- Akwụkwọ ọgụgụ
- Ụmụaka n’onwe ha
Evaluation Guide
- ịgụtali ejije a họpụtara
- ịkọwa ihe mmụta abụọ dị n’ejije
Week 4
Topic: Okwuntụhị
Performance objectives
- ikwupụta ma kọwapụta okwuntụhị nke ọma
- Ịchọtali okwu ndị ha na ibe ha yiri n’ụda
- igosipụta mmasị na obiụtọ dị n’ikwu okwuntụhị
Contents
- Okwuntụhị dị iche iche
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọmụmaatụ
- Nzipụta
- Ajụjụ
Student’s Activities
- Ige nti
- Ikwu okwuntụhị
- Ịjụ ajụjụ.
- Ịza ajụjụ
- Ịgụ okwuntụhị
- Ide okwuntụhị
Teaching & Learning Material
- Eserese
- Chaatị
- aadị
Evaluation Guide
- Iju ajụjụ
- iku okwuntụhị
- okwuntụhị
- ide okwuntụhị ise
SUBJECT: IGBO LANGUAGE CLASS LEVEL: PRIMARY 5
THEME 3: OMENALA
Week 1
Topic: Idobe gburugburu ọcha
Performance objectives
- ikwu ụzọ ilekọta gburugburu
- ikwu uru ọ bara ilekọta gburugburu
Contents
- Ụzọ nlekọta gburugburu
- dịka: ịza ihe, ikpofu ahịhịa ebe o kwesịrị, ịnyụ mamịrị na nsị ebe ha kwesịrị
- Uru nlekọta gburugburu bara
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ngosipụta
- Ọmụmaatụ
- Ọgụgụ
- Ajụjụ na azịza
- Ejije
- Ide ihe odide
Student’s Activities
- Ige ntị
- Ịkparịta ụka
- Ịjụrịta ajụjụ na ịzarịta ajụjụ
- Ije ejije
- Ịgụ ihe ọgụgụ
- Ide ihe odide
Teaching & Learning Material
- Ederede
- Mgbubam
- Eserese
- Redio
- Chaatị
Evaluation Guide
- ikwu uru ọ bara ilekọta gburugburu
- Ikwu ụzọ ilekọta gburugburu
Week 2
Topic: Mmemme Ọdịnala (Ịgụ nwa aha)
Performance objectives
- ikpọpụta aha Igbo dị iche iche
- Ikwu mgbe na etu e si agụ nnwa aha n’ala Igbo
- Ikwu mpụtara aha ụfọdụ na mkpa ha dị
Contents
- Aha Igbo dị iche iche dk: Chiamaka, Chukwudị, Amarachukwu, Chinemerem, dg
- Mgbe a na agụ nnwa aha
- Etu e si agụ nnwa aha
- Mpụtara aha ụfodu na mkpa ha di.
Teacher’s Activities
- Ajụjụ na aziza
- Ngosipụta
- Ejije
- Ọmụmaatu
- Nkọwa
Student’s Activities
- Ịkpọsi aha ha na aha Igbo ndiọzọ
- Ikwu mpụtara aha ndị a
- Ịkọwa mgbe na etu e si agụ nnwa aha
Teaching & Learning Material
- Eserese
- Chaati
- Akwụkwọ ọgụgụ
- Ụmụaka n’onwe ha
Evaluation Guide
- ịkpọpụta aha Igbo ise
- Ịkọwa etu e si agụ nnwa aha na onye na- enye aha
- Ikwu mpụtara aha ụfodu ha kpopụtara
Igbo Curriculum for Primary 6
THEME 1: OMENALA
Week 1
Topic: Orubere na ọrụ ụmụaka
Performance objectives
- ịkọwa ihe bụ orubere ha
- ịkọwa ihe bụ oke na ọrụ ha
- ikwu uru ọ bara inye ụmụaka orubere ha
- ikwu uru ọ bara ụmụaka ịma oke na ọrụ ha
Contents
1 Orubere ụmụaka
2 Oke na ọrụ ụmụaka
3 Uru inye ụmụaka orubere
4 Uru ụmụaka ịma oke na ọrụ ha
Teacher’s Activities
1 Nkọwa
2 Ọmụmaatụ
3 Ntụlekọta uche
4 Ajụjụ na azịza
5 Ọgụgụ
6 Odide
7 Ejije
Student’s Activities
1 Ikọwa ihe bụ orubere ha
2 Ịkọwa ihe bụ oke na ọrụ ha
3 Ikwu uru ọ bara inye ụmụaka orubere ha
4 Ikwu uru ọ bara ụmụaka ịma oke na ọrụ ha
5 Ijepụta ejije
6 Ise eserese
Teaching & Learning Material
- Eserese Chaatị Akwụkwọ ọgụgụ Foto
Evaluation Guide
- ịkọwa ihe bụ orubere ha
- ịkọwa uru ọ bara inye ụmụaka orubere ha
- ịkọwa ihe bụ oke na ọrụ ha
- ikwu uru ọ bara ụmụaka ịma oke na ọrụ ha
Week 2
Topic: Ọjị
Performance objectives
1 ịkọwa ihe bụ ọjị
2 ịkọwa ihe e ji ọjị eme
3 ikwu ihe na- anọchị anya ọjị na uru ọjị bara
Contents
1 Nkọwa ọjị
2 Ihe e ji ọjị eme
3 Ihe na-anọchi anya ọjị
4 Uru ọjị bara
Teacher’s Activities
1 Nkọwa
2 Ngosi
3 Ọmụmaatụ
4 Odide
5 Ajụjụ
6 Mgbazi
Student’s Activities
1 Ikọwa ọjị
2 Ikwu ihe e ji ọjị eme
3 Ikwu ihe na-anọchị anya ọjị na uru ọjị bara
Teaching & Learning Material
1 Ọjị na ose ọjị
2 Aṅara na akụilu
3 aadị
4 Eserese
5 Ejije
Evaluation Guide
1 ịkọwa ihe bụ ọjị
2 ikwu ihe na-anọchi anya ọjị
3 ikwu uru ọjị bara
4 ide ahịrịokwu ise banyere ọjị
5 ịkọpị nootu
Week 3
Topic: Ịzụ/ịṅụ ọgwụ agharaaghara
Performance objectives
- ịkọwa ihe bụ ọgwụ
- ịkpọpụta ụdị ọgwụ dị iche iche.
- ikwu onye kwesịrị ide ọgwu a ga-aṅụ
- ikwu nsogbu dị n’ịzụ/n’ịṅụ ọgwụ aghara-aghara
Contents
- Nkọwa ihe bụ ọgwụ
- Mkpọpụta aha ọgwụ dị iche iche.
- Mgbe e ji aṅụ ọgwụ
- Onye kwesịrị ide ọgwụ a ga aṅụ
- Ebe e kwesịrị ịzụta ọgwụ
- Nsogbu dị n’ịzụ/n’ịṅụ ọgwụ agharaaghara
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Mkpọpụta
- Mkparịtaụka
- Ejije
- Ngosipụta
- Eserese
Student’s Activities
- Ịkọwa ihe bụ ọgwụ
- Ịkpọpụta ụdị ọgwụ dị iche iche
- Ikwu mgbe e ji aṅụ ọgwụ
- Ikwu onye kwesịrị ide ọgwụ
- Ikwu ebe e kwesịrị izụta ọgwụ.
- Ikwu nsogbu dị n’ịzụ/n’iṅụ ọgwụ agharaaghara
Teaching & Learning Material
- Ọgwụ Ngwa ọgwụ Eserese Chaatị Foto.
Evaluation Guide
- ịkpọpụta aha ọgwụ anọ ha maara
- ikwu onye kwesịrị ide ọgwụ
- ikwu nsogbu abụọ dị n’ịṅụ ọgwụ agharaaghara.
Week 4
Topic: Mgbanwe na- abata n’omenala
Performance objectives
- ịkọwa ihe bụ omenala
- ịkọwapụta ihe mgbanwe ụfọdụ na-abata n’omenala obodo dịka nri, ejiji, uri/egwu dg.
- izipụta mmasị, n’ ịkwalite omenala ụfọdụ ndị dị mma na- adaghachi azụ dịka: mgba, egwu ọnwa. ịtụ okwe dg.
- ikwu uru ịkwalite omenala igbo bara
Contents
- Nkọwa ihe bụ omenala
- Mgbanwe ụfọdụ na-abata n’omenala obodo
- Nkwupụta omenala ụfọdụ na-ala azụ
- Uru ịkwalite omenala Igbo bara
Teacher’s Activities
1 Nkọwa
2 Ajụjụ na azịza
3 Ejiji Igbo ụfọdụ
4 Ngosipụta
5 Ọmụmaatụ
Student’s Activities
1 Ịkọwa ihe bụ omenala
2 Ikwu mgbanwe ụfọdụ na-abata n’omenala obodo
3 Ikwu uru ịkwalite omenala Igbo bara
4 Ịjụpụta nne na nna ha omenala ụfọdụ nke obodo ha
5 Ịkọpụta ihe ha jụpụtara
6 Ịjụ na ịza ajụjụ
Teaching & Learning Material
1 Eserese
2 Ngwa mmetụaka
3 Akwụkwọ ọgụgụ na ihe ọgụgụ ndị ọzọ
Evaluation Guide
1 ijụ na ịza ajụjụ
2 ikwu omenala ndị batara ọhụrụ
3 ikwu omenala ndị dachapụrụ adachapụ
4 idepụta aha omenala ise
Week 5
Topic: Nzikọrịta ozi (Keọdịnala na keugbu a)
Performance objectives
- ikwu ụzọ dị iche iche e si
- ikwu ụfọdụ ngwa nzikọrịta ozi e nwere n’ala Igbo
- ikwu ụzọ nzikọrịta ozi dị ugbu a
- i kpọpụta ngwa nzikọrịta ozi ndi e nwere ugbu a
- ikwu uru nzikọrịta ozi
Contents
- Ụzọ nzisa ozi keọdịnala dịka: okwuọnu , ekwe, egbe, ikoro, dg
- Ụzọ nzisa ozi keugbu a dịka: ekwentị, redio, tiivii, nuzpepa, kọmputa dg
- Uru nzikọrịta ozi
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ngosi
- Nduzi
- Nzirịta ozi
- Ajụjụ
- Ejije
Student’s Activities
- Ige ntị
- Ikwu ụzọ nzikọrịta ozi
- Izi ozi
- Ikwu uru izisa ozi bara
- Ise ihe
- I gụ ihe
Teaching & Learning Material
- Ngwa nzisa ozi Eserese Chaatị
Evaluation Guide
- Ikwu ụzọ atọ e si ezikọrịta ozi keọdịnala
- Ikwu ụzọ atọ e si eziko ri ta ozi keugbu a
- Ide uru abụọ dị na nzisa ozi
Week 6
Topic: Ụzọ ndị Igbo si achọ mma
Performance objectives
- ịkọwa ihe bụ ịchọ mma
- ikwu ụzọ dị iche iche e si achọ mma
- ikwu uru ịchọ mma bara
Contents
- Nkọwa ihe bụ ịchọ mma
- Ụzọ dị iche iche e si achọ mma
- Ụzọ dị iche iche Igbo si achọ mma dịka: ite ude, ide uri, igbu ichi/egbugbu, ibi mbibi/ ite uhie, ide ọtanjele, ịkpa isi, mgbaji/jigida, aka, ọjị, esuru, ọdụ dg
Teacher’s Activities
- Nkọwa.
- Ọmụmaatụ
- Ngosi
- Mkparịtaụka
- Nrụgosi
- Ejije
- Ọgụgụ
- Odide
Student’s Activities
- Ịkọwa ihe bụ ịchọ mma
- Ikwu ụzọ dị iche iche e si achọ mma ugbu a
- Ikwu ụzọ dị iche iche ndị Igbo si achọ mma
- Ikwu uru ịchọ mma bara
- Ise eserese
- Ije ejije
- Ịrụgosi ihe e ji achọ mma
- Ịgụ ihe ọgụgụ
- Ide ihe odide
Teaching & Learning Material
- Ngwa ndị e ji achọ mma Eserese Foto Akwụkwọ ọgụgụ Chaatị kaadị
Evaluation Guide
- ikwu ụzọ dị iche iche ndị Igbo si achọ mma ikwu uru atọ ịchọ mma bara
SUBJECT: IGBO LANGUAGE CLASS LEVEL: PRIMARY 6
THEME 2: ASỤSỤ
Week 1
Topic: Iji nkenke akụkọ ndị a họpụtara kuzie aghọtaazaa
Performance objectives
- ịgụtali Igbo nke ọma
- ịkọ gbasara akụkọ ha gụrụ
- iji ọkọwa- okwu chọpụta mpụtara ụfọdụ mkpụrụokwu
- i za ajụjụ so ihe ha gụrụ
Contents
- Ọgụgụ
- Nkọwa isi ihe a gụrụ
- Nkọwa okwu ndị siri ike n’ihe a gụrụ
- Ajụjụ so ihe a gụrụ
Teacher’s Activities
- Ọgụgụ
- Nkọwa
- Ajụjụ
- Ọmụmaatu
Student’s Activities
- Ịgụ ihe ọgụgụ
- I jụ na iza ajụjụ
- Ikwu uche ha banyere ihe a gụrụ
Teaching & Learning Material
- Akwụkwọ ọgụgụ
- Eserese
- Tepurekọda
Evaluation Guide
- ịkọwa isiokwu dị n’ihe ha gụrụ
- ịkọwa mkpụrụokwu atọ siri ike dị n’ime ihe ha gụrụ
- iza ajụjụ banyere ihe ha gụrụ
Week 2
Topic: Mkparịtaụka (Ibi n’udo)
Performance objectives
- Ịkọwa ihe bụ ibi n’udo
- Ikwu ụzọ dị iche iche e si ebi n’udo
- Ikwupụta uru dị n’ibi n’udo
- Ikparịta ụka gbasara ihe ndị ahụ na-ebute adịghị n’udo
Contents
- Nkọwa ihe bụ ibi n’udo; ụzọ e si ebi n’udo
- Uru dị n’ibi n’udo
- Mkparịtaụka gbasara ihe na-ebute adịghị n’udo.
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọmụmaatụ
- Ngosipụta
- Ejije
- Ajụjụ
Student’s Activities
- Ige ntị
- Mkparịta ụka gbasara ụzọ e si ebi n’udo
- Ikwu uru dị n’ibi n’udo
- Igosipụta site n’ejije akparamagwa na-egosi ibi n’udo.
Teaching & Learning Material
- Eserese
- Chaatị
- Akwụkwọ
- Vidio
Evaluation Guide
- ịza ajụjụ
- ikwu uru anọ dị n’ibi n’udo
- ikwu ihe atọ nwere ike ibute adịghị n’udo
- ije ejije na-egosị ibi n’udo
Grade 6 NERDC Igbo Language Curriculum for Primary 6. Nkenke abụ, orubere, ọgwụ agharaaghara, keọdịnala, edemede – Schemeofwork.com
Week 3
Topic: Ọnụọgụgụ 1 – 500
Performance objectives
- ịgụtali ọnụọgụgụ site otu ruo narị
- igụ na narị na narị
- idetali ọnụọgụgụ
Contents
- Ngụpụta ọnụọgụgụ 1 – 500
- Ịgụ na narị na narị
- Odide ọnụọgụgụ
Teacher’s Activities
- Okwe
- Ịgụpụta ihe
- Ịkpọ ọga
- Ịkụ aka
- Odide
- Mmakọta
Student’s Activities
- Ịgụpụta ọnụọgụgụ
- Ịgụ na narị na narị
- Odide ọnụọgụgụ
Teaching & Learning Material
- Chaatị
- Mkpụrụ okwe
- Okwuchi karama
- Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
- Ịgụtali ọnụọgụgụ bido otu ruo narị ise
- Ikwu nkeji ọnụọgụgụ ole mejupụtara 1 – 500
- Idetali ọnụọgụgụ na narị na narị
Week 4
Topic: Aghọtaaza
Performance objectives
- ịkọwa ihe bụ aghọtaazaa
- ịgụtali ihe
- ịkọwa mkpụrụokwu ọhụrụ na ilu dị mfe
- ịzatali ajụjụ site n’ihe a gụrụ
Contents
- Nkọwa aghọtaazaa
- Nkọwa mkpụrụokwu ọhụrụ na ilu
- Ọgụgụ
- Ajụjụ na azịza
- Ihe mmụta dị n’ihe a gụrụ
- Omenala Igbo pụtara ihe
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọgụgụ
- Ọmụmaatụ
- Ajụjụ na azịza
- Ngosipụta
- Odide
Student’s Activities
- Ịkọwa ihe bụ aghọtaazaa
- Ịgụ ihe n’obi
- Ịgụ na ịza ajụjụ.
- Ikwu ihe mmụta
- Ikwu omenala pụtara ihe
- Ide ihe odide
- Ise eserese.
Teaching & Learning Material
- Akwụkwọ ọgụgụ Eserese Chaatị. Kaadị
Evaluation Guide
- ịkọwa ihe bụ aghọtaazaa
- ịzatali ajụjụ site n’ihe a gụrụ
Week 5
Topic: Edemede nduzi
Performance objectives
- ịkọwa ihe bụ edemede
- ikwu njirimara edemede, dk isiokwu, nhazi n’usoro dg
- ikwu usoro ide edemede dịka: mbido, ahụ na mmechi
- idetali edemede dị mfe
Contents
- Nkọwa ihe bụ edemede
- Njirimara edemede
- Ntụta aro ihe onyenkuzi ga-ede n’ụgbọojii
- Ndetu ihe e dere
- Odide edemede nke ha
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ọmụmaatụ
- Ngosipụta.
- Ajụjụ na azịza
- Odide ndekọrịta
- Nduzi.
Student’s Activities
- Ịkọwa ihe bụ edemede
- Ikwu njirimara edemede
- Ịkparịta ụka
- Ịtụ aro
- Idetu ihe e dere n’akwụkwọ ha
- Ide edemede ha
Teaching & Learning Material
- Eserese Flash kaadị. Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
- ịikwuputa usoro atọ dị n’edemede
- idetali edemede nke ha
SUBJECT: IGBO LANGUAGE CLASS LEVEL: PRIMARY 6
THEME 4: AGỤMAGỤ
Week 1
Topic: Nkenke abụ
Performance objectives
- ịgụ abụ ndị a họpụtara
- i ru gosi ndako ri ta mkpụrụokwu
- ịmụta abụ ahụ
- i gụ abụ ahụ
Contents
- Nkenke abụ dị iche iche
- Ụfọdụ mkpụrụokwu si n’ime abụ ndị ahụ
Teacher’s Activities
- Ọgụgụ
- Okwukwe
- Ejije
- Ajụjụ na azi za
- Nkọwa
Student’s Activities
- Ịgụ abụ
- Ikwe abụ n’isi
- I ju na i za ajụjụ
Teaching & Learning Material
- Eserese
- Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
- ịgụ nkenke abụ abụọ
- ịrụgosi ndakọrịta mkpụrụokwu
Week 2
Topic: Ilu dị mfe
Performance objectives
- ịtụ ilu dị mfe
- ịkọwapụta ilu
- izipụta nghọta ilu
- ikwu ihe mmụta dị n’ilu
Contents
1 Ilu dị iche iche na nkọwa ha
2 Ihe mmụta dị n’ilu
3 Omenala Igbo pụtara ihe n’ilu
Teacher’s Activities
1 Nkọwa
2 Ọmụmaatụ
3 Nzipụta
4 Ajụjụ na azịza
5 Eserese
6 Ọgụgụ
7 Nchọpụta
Student’s Activities
1 Ige ntị.
2 Ịtụ ilu
3 Ịkọwa ilu
4 Ịjụ na ịza ajụjụ
5 Ide ihe odide
6 Ise eserese
7 Ịgụ ihe ọgụgụ
Teaching & Learning Material
- Eserese Chaatị aadị Akpụrụakpụ ihe ndị a na- ahụ anya Akwụkwọ ọgụgụ
Evaluation Guide
- ịtụ ilu anọ ma kọwaa ha.
- ikwu ihe mmụta dị n’ilu
Week 3
Topic: Ejije
Performance objectives
- ijije omume dibịa bekee, nọọsụ, njinịa, onyenkụzi, onyesọja, onyeọrụugbo. ọzụahịa, onyeeze, ọkaikpe. dg.
Contents
- Omume dịka: dibịa bekee, njinịa, onyenkụzi, dg.
Teacher’s Activities
- Nkọwa
- Ngosipụta
- Ejije
- Nduzi
- Ajụjụ na azịza
Student’s Activities
1 Ige ntị
2 Ile anya
3 Ịkparịta ụka
4 Ije ejije
5 Ịjụ na ịza ajụjụ 6 Ise eserese
Teaching & Learning Material
- Ngwa na ngwongwo kwesịrị ejije nke ọ bụla
Evaluation Guide
- ịjụ na ịza azịza
- ije ejije
- ise eserese
READ ALSO
Igbo Language Curriculum for Primary 4
Igbo Language Curriculum for Primary 5
Igbo Language Curriculum for Primary 6
Igbo Curriculum for Primary 1 to 3